ỌGBỤGBA AMA NDỤ NṄOMI NKE CHIEF EMMANUEL ANYADIKE
Ọnwụ bụ ụzọ onye ọ bụla dị ndụ aghaghị ịgafe. Ndị Igbo jiri kwuo sị na mma niile gaje n'ụzụ! Ọ bụ ihe mwute na onye ị hụrụ taa, echi ị gaghị ahụkwa ya ọzọ. Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-egbu... see moreỌGBỤGBA AMA NDỤ NṄOMI NKE CHIEF EMMANUEL ANYADIKE
Ọnwụ bụ ụzọ onye ọ bụla dị ndụ aghaghị ịgafe. Ndị Igbo jiri kwuo sị na mma niile gaje n'ụzụ! Ọ bụ ihe mwute na onye ị hụrụ taa, echi ị gaghị ahụkwa ya ọzọ. Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-egbu mmụọ. Ma akwụkwọ Nsọ na-agbaziri anyị ka anyị ghara ịkwa ákwá ma ọ bụ ruo ụjụ dị ka ndị na-enweghị olileanya. Ka olileanya anyị bụrụ n'ime Chineke onye na-enye ndụ ebighebi.
Ọ wutere m nke ukwuu mgbe m nụrụ ozi banyere ngafe na ndụ ebighebi nke nwanna nwoke Chief Emmanuel Anyadike, onye nke mgbaziri ya dị ka nna nyeere mu na ụmụnne m aka ịbụ ihe anyị bụ taa. Ma aṅụrị m na-enwe bụ na ọ biri ndụ ya nke ọma dị ka nwa Chineke. Ya bụ na nkwa Chineke kwere ndị hụrụ ya n'anya na-echere ya n'ime Jeruselem ọhụụ!
Mụ na ezinụlọ m agaghị echefu ọsọ enyemaka Chineke jiri nwanna nwoke gbatara anyị mgbe nna m bụ Gabriel Okoli Okeke, nwụrụ. Ihe m na ụmụnne bụ taa bụ site n'amara Chineke nke o siri n'aka oru ya nwoke, Chief Anyadike, were gosi mụ na ndị ezinụlọ m mgbe ahụ ọ gbajuru dọrọ. O buuru ihe gbasara anyị n'isi dị ka ọ bụ nke ya wee ruo mgbe anyị niile guputachara akwụkwọ were kwụrụ na nke onwe anyị. Ọ jugidekwara ese ọdị mma anyị ruo izu ụka ole na ole mụ na ya kpara n'ekwe ntị tupu e zite ozi maka ọnwụ ya.
Ka ndụ fọrọ anyị, anyị agaghị echefu ọrụ ọma nke a Chineke jiri ya kwara na ndụ anyị. Abụ 239, nkebi nke mbụ sị :
Nagafe dị ka kpakpando nke ụtụtụ
N'ihe-ha furu mgb'anyanwu wara
Otu a k'ayi gesi n'oluwa nkà la
Nanị n'olu-ayi k'ageji chetayi.
E ji m ohere a na-ekele Chineke nke ukwuu na o kwere ka m soro rite uru site n'ọrụ ọma a oru ya nwoke rụrụ n'ụwa a. Arịrịọ m na-arịọ Chineke bụ ka o kwe ka anyị niile bụ ndị fọrọ afọ na-eru ụjụ taa, soro wee rụọ ọrụ dị mma nke a ga-esi na ya cheta anyị mgbe anyị gabigara. Ka mgbe Jizọs ga-abịa ọzọ, ma ọ bụ mgbe anyị nọchaara n'ụwa wee laa, anyị e soro wee keta oké n'alaeze ya.
N'iga n'iru na Abụ 239, nkebi nke anọ ya, ọ sị:
Mgbe Jizọs gaguko ndị nke-ya ọnụ
Mgb'ayi gekpu okpu-eze nk'ok'onu
Mgb'ahu k'agecheta ezi nd'oru - Ya
Ha niile, site n'olu ha lụrụ.
Dị ka anyị na-eru ụjụ nwanne anyị nwoke na nna anyị, ka o biri anyị ebiri na ntị na otu ụbọchị, Jizọs ga-aguko ndị ya ọnụ; wee kwụọkwa ha ụgwọ dị ka ọrụ ha siri dị. Oke na ọrụ anyị ugbu a ndụ ka fọdụrụ bụ ịnabata Jizọs Kraịst dị ka onye nwe anyị na onye nzọpụta anyị. Mgbe anyị mere nke a, ọ ga-ezipu anyị n'ike Mmụọ nsọ ya ịrụ ezi ọrụ ga-ewetara Chineke otuto ma wetara anyị ngọzi na ụgwọ ọrụ nke alaeze ebighebi!
Ka Chineke ji ike niile were Mmụọ nsọ ya gbaa anyị niile bụ ndị na-eru ụjụ a ume site na Jizọs Kraịst onye nwe anyị. Amen.
Jee nke ọma Agunechemba. Okwukwe m bụ na anyị ga-ahụ anya ọzọ na ụbọchị mbilite n'ọnwụ.
Dr. Chinedu Okoli
(N'aha ezinụlọ Gabriel Okoli Okeke lara mmụọ).